NNYOCHA OMENAALA IGBO A NA-AKỤZIRI ỤMỤ AKWỤKWỌ SINỊỌ SEKỌNDỊRỊ TUPU E NWEE NZURUỤWA.

  • Dr Mrs Charity Ijeoma Ogbu
  • Prof. Uju C. Umo
Keywords: Nzuruụwa, Mmetụta Nzuruụwa, Omenaala, Omenaala Igbo, Agụm akwụkwọ ọdnaala.

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’omenaala Igbo a na-akụziri ụmụ akwụkwọ sinịọ sekọndịrị tupu e nwee nzuruụwa. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta omenaala Igbo dị iche iche dịka nkwenye ndị Igbo, asụsụ Igbo, echichi, agụmagụ ọdịnaala, ewumewu, alụmalụ, ekpemekpe, ọrụ nkanaụzụ, ekike, nri, na amamiihe ọdịnaala Igbo a na-akụziri ụmụ akwụkwọ sinịọ sekọndịrị tupu e nwee nzuruụwa. Otu ajụjụ nchọcha ka e ji mee nchọcha a. Usoro nkọwa sọvee ka a gbasoro wee mee nchọcha a. Ndị e ji mee nchọcha bụ ụlọakwụkwọ sekọndịrị niile gọvmenti nwe na mpaghara Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Usoro nhọrọ igwe ka a gbasoro wee họpụta ndị e jiri mee nchọcha a maka ihe agbamonwe jenda na mpaghara ụlọakwụkwọ dị. Usoro nhọrọ ebumnobi ka e ji họpụta steeti atọ e jiri mee nchọcha. Onye nchọcha gbasoro usoro nhọnanha wee họpụta ụlọakwụkwọ dị 246 na ndị nkuzi dị 246 zara njụmaza. Ndị e jiri mee nchọcha bụ ndị isi nkuzi Igbo. Ngwa nchọcha e jiri mee nchọcha gụnyere njụmaza isiokwu ya bụ Ajụjụ Gbasara Nzụrụ Ụwa na Nkụzi na Ọmụmụ Omenaala Igbo (AGNNỌOI). Ihe e nwetara maka adịmụmma ngwa bụ 0.86. N’ịhazi ihe a chọpụtara, a gbasoro usoro ntụcha Miin na ndịpụ n’izugbe wee zaa ajụjụ nchọcha ma were nnwalet (t-test) wee nweta ọsịsa ụmaokwu nchọcha e hibere n’akara ntụ 0.05. Ihe a chọpụtara na nchọcha a gosiri na e nwere ọtụtụ omenaala a na-akụziri ụmụaka site n’agụm akwụkwọ ọdịnaala tupu e nwee nzuruụwa. Site n’ihe a chọpụtara n’elu, onye nchọcha tụrụ alo mkpa ọ dị ịhazịrị ndị nkuzi wọkshọp ịmata mkpa ọ dị inyefe omenaala Igbo n’aka ụmụ akwụkwọ dịka o si dị ire n’oge agụm akwụkwọ ọdịnaala.

Published
2024-08-16
Section
Articles