Ịnwale ka Mpaghara a Rụnyere Ụlọakwụkwọ si Emetụta Mmeta Nke ọma Ụmụ akwụkwọ ma e Jiri Ngwa Nkụzi Nụrụlere Kuziere ha Agụmagụ Ọdịnaala Igbo

  • Ewelum, Chinyelum Patricia
  • Ezema, Chinenye Anthonia

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’ịnwale ka mpaghara a rụnyere ụlọakwụkwọ si emetụta mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ ma e jiri ngwa nkụzi nụrụlere kuziere ha agụmagụ ọdịnaala Igbo. Otu ajụjụ nchọcha na otu ụmaokwu bụ ihe nyere aka maka nchọcha a. Kwazi ‘experimental’ ka a gbasoro mee nchọcha a. Ọnụọgụ e ji mee nchọcha bụ ụmụ akwụkwọ dị puku ise narị abụọ na asaa (5,207) ebe ndị e seere dị narị abụọ na iri abụọ (220). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha bụ Nnwale Mmetadebe Agụmagụ Ọdịnaala Igbo (NMAỌI), Ngụkọ Mpaghara a Rụrụ Ụlọakwụkwọ na Mmeta Nke ọma Ụmụ akwụkwọ N’agụmagụ Ọdịnaala Igbo (NMRỤMNỤAỌI). NMAỌI dị njụmaza iri abụọ. NGMỤNAỌI nwere njụmaza iri abụọ. Ihe nlere anya anọ ka e wepụtara dị ka o si metụta ọsịsa nke onye kwenyere na ya bụ nke ndị ọkammụta atọ lebara anya. Ngwa Nchọcha NMAỌI ka elelere ndịgide site n’iji usoro ntụcha data a kpọrọ Kuder Richardson (K – R 20). Ihe e nwetara bụ 0.71, NGMỤNAỌI ka e jiri ntụcha data a kpọrọ ‘Crobacks Alpha Coefficient’, ihe e nwetara n’adịmmma ngwa bụ 0.88. Tupu e bido nkuzi, e nyere ụlọakwụkwọ abụọ nke ọ bụla n’ime ndị a họpụtara n’ime ụlọakwụkwọ anọ nnwale nganihu. Ihe e nwetara na data ka e ji wee zaa ajụjụ nchọcha na ụmaokwu. E ji miin na ndịpụ n’izugbe wee zaa ajụjụ nchọcha ma werekwa akara ntụ 0.05 nwalee ụmaokwu. Ihe a chọpụtara na nchọcha gosiri na ụmụ akwụkwọ ndị bi n’ime obodo ka nwee mmasị ma meta nke ọma n’agụmagụ ọdịnaala Igbo karịa ụmụ akwụkwọ bi n’obodo mepere emepe. Site na nchọpụta nchọcha a, e kpebiri ka e jiri ngwa nkuzi nụrụlere kuziere ụmụ akwụkwọ praịmarị ma n’obodo mepere emepe ma n’ime obodo agụmagụ ọdịnaala Igbo ka ha wee nwee ike meta nke ọma n’agụmagụ ọdịnaala Igbo. Ọ bụrụ na ndị nkuzi ejiri ngwa nkuzi nụrụlere kuziwe agụmagụ ọdịnaala Igbo na praịmarị niile dị na zoonu mmụta Nsụka, a mara na ụmụ akwụkwọ ndị bi n’obodo mepere emepe na ụmụ akwụkwọ ndị bi n’ime obodo ga-emeta nke ọma n’agụmagụ ọdịnaala Igbo.

Veröffentlicht
2024-06-17
Rubrik
Articles