Nzipụta Ọnọdụ Ụmụ Nwaanyị n’Iduuazị Igbo dị Ugbu A
Abstract
Nchọcha a lebara anya n’ọnọdụ ụmụ nwaanyị n’ala Igbo. Ndị ọkaa asụsụ Igbo e meela nchọcha banyere agwaa ụmụ nwaanyị n’ala Igbo dika e si zipụta ha n’iduuazi Igbo ndị gụnyere Onye Kpa Nkụ Ahụhụ (Nwadike, 1989), Isi Akwụ Dara n’Ala (Ubesie, 1973) na Chinaagọrọm (Onwuchekwa, 1983). Site na ha, a kọwara ụmụ nwaanyị dịka ndị na-enwe ndidi na ogologo ntachụ obi; ndị arụrụ ala hụbịgara ego n’anya nke ukwu; nakwa ndị nwere mmetụta uche na obi ebere ebe ihe ha nọ n’otu n’otu. Nchọcha a zipụtara ọnọdụ ụmụ nwaanyi n’ala Igbo dịka o si pụta ihe n’iduuazi ndị a gbadoro ụkwụ mee nchọcha a, ndị gụnyere Adaeze (1998) nke sitere n’aka Innọ Nwadike na Ọdị Ụkọ Na Mba (2003) nke C. N. Okebalama dere. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha a bụ atụtụ anyịmihe. Nchọcha a kwenyere na ụmụ nwaanyị kwesịrị ka a na-enye ha nsọpụrụ na ugwu kwesịrị ha; e kwesịghị ka ha na-ama ụmụ nwoke aka n’ihu n’ihi na Chineke sitere n’omenaala Igbo mee ụmụ nwoke isi. Ihe ọmụmụ a chọpụtara na ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-agba mbọ maka ọganihu ezinaụlọ na obodo ha n’agbanyeghi na e nwekwara ndị isi agbọ ncha n’etiti ha. N’aka nke ọzọ e nwekwara ụmụ nwoke na-agba mbọ nwekwa ndị nzuzu. Ọganihu ezinaụlọ ka dị ụmụ nwaanyị n’aka n’agbanyeghi na ọnọdụ ụmụ nwaanyị n’omenaala Igbo erughi nke ụmụ nwoke dịka ọ pụtakwara ihe n’iduuazị ndị a anyị jiri mee nchọcha a.