Ịchọ Mma dịka Ngosipụta Ntozuoke Ụmụagbọghọ maka Alụmdi n’ala Igbo
Abstract
Tupu nwaanyị alụọ di, o kwesiri ịdị nkwadobe maka ihe ịmà aka dị n’alụmdi na nwunye. Ọ bụ ọnọdụ a mere ndị ọchọcha jiri bagide nchọcha a iji kọwapụta ụdịdị ịchọ mma dị iche iche, uru na ọghọm dị na nke ọbụla nakwa ụzọ ịchọ mma si akwalite obibi ndụ ndị mmadụ ọ kachasị ụmụagbọghọ ndị tozuworo ihe e ji nwaanyị eme. Nchọcha a bụ nke ga-akpọlite agụrụ ịchọ mma ọdịnaala Igbo dịka otu ụzọ e si akwalite omenaala Igbo; a gbasoro usoro nchọcha ndịzịma ebe e weere atụtụ nchọcha agbụrụ dịka ebe mgbakwasa ụkwụ. Njirime nchọcha a bụ ụmụada Igbo ndị na-agụ akwụkwọ na Mahadum Alex Ekwueme nke Ndufu-Alike Ikwo na Steeti Ebọnyi. Nchọcha a chọpụtara na ọchịchọ mma malitere n’oge gboo. Njiachọmma ndị gboo na-eme ka ahụ gbasie mmadụ ike, akwọ mụrụmụrụ ma dị ọgọ na anya. Ha gụnyere: nzu, odo, ọkpaliko, uhie, uli na ihe ndị ọzọ a na-enweta n’osisi na ala nakwa ejiji dị iche iche. Njiachọmma ndị agba ọhụrụ bụ ndị sitere n’aka ndịọcha; e jikwa ọtụtụ ihe emepụta ha ebe ọtụtụ n’ime ha na-ebute ọnya álāālà na ọrịa dị iche iche. Nchọcha a chọpụtakwara na ụmụ nwoke na-achọkwa mma n’ụdị nke ha mana ndị tara isi ya bụ ụmụ nwaanyị, ọ kachasị ụmụagbọghọ. Oke ntecha na-emechu nwaanyị ihu ọ kachasị ebe ndị na-etorubeghị nọ. Ịchọ mma dị mkpa n’ezinaụlọ ọbụla n’ihi na ọ na-akwalite mmekọrịta di na nwunye ma si ụzọ ahụ kwalite obibi ndụ ha. A na-emepe obodo site n’ịchọ ya mma. Ndị ọchọcha tụrụ aro na ọ ga-adị mma ma a kwalite ngwaa njiachọmma Igbo site n’ịgba ha na mkpọ̀ ma mee ka ọ dị mfe iji gaa njem; site otu ahụ kwalite akụnaụba, azụmahịa na omenaala Igbo.