ADỊMIRE OJIJI OSISI ESERESE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ IGBO N’ỤLỌAKWỤKWỌ SINỊỌ SEKỌNDỊRỊ NA MPAGHARA MMỤTA NSỤKA.
Abstract
Nchọcha a lebara anya na adịmire ojiji osisi eserese na nkuzi ụtọasụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na mpaghara mmụta Nsụka. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu osisi eserese ga-esi nye aka n’ime ka ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma n’ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na mpaghara mmụta Nsụka. Otu ajụjụ nchọcha na otu ụmaokwu nchọcha ka e ji wee mee nchọcha a. Onye nchọcha gbasoro usoro ‘quasi-experimental’ n’asụsụ bekee wee mee nchọcha ya. E ji usoro nhọrọ nsere họpụta ụlọakwụkwọ abụọ ma were usoro ebunobi wee họpụta ụmụ akwụkwọ sịnịọ sekọndịrị nke abụọ (SS II) dị iri asatọ na ise sitere na klasi abụọ e jiri mee nchọcha. Klasi abụọ e ji mee nchọcha bụ nke mmebere ya gụnyere otu nchọpụta na otu ntụnyere. Ngwa e jiri mee nchọcha a bụ nke a kpọrọ Nnwale iji osisi eserese kụzie ụtọasụsụ Igbo (NIOEKỤI). Maka inyocha ngwa nchọcha, ndị nkụzi abụọ na ngalaba amụmamụ Igbo na otu onye nkụzi na-akụzi na ngalaba measurement na evaluation lebara anya na ya, bụ ndị si na ngalaba mahadum nke Naịjirịa Nsụka. E jiri ntụcha mini na ndịpụ n‘izugbe wee nweta ọsịsa nchọcha, were ‘analysis of covariance (ANCOVA) na bekee wee nwalee ụmaokwu nchọcha n’ogo ntụ 0.05. Nchọcha e mere gosiri na iji osisi eserese na-emetụta ụmụ akwụkwọ n’ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na mpaghara mmụta Nsụka. Ihe nke a pụtara bụ na na ụmụ akwụkwọ ndị e jiri osisi eserese kụziere ụtọasụsụ Igbo mere nke ọma karịa ndị a na-ejighi wee kụziere. Site n’ihe a chọpụtara, onye nchọcha tụtara alo mkpa ọ dị, inye ndị nkuzi ọzụzụ ịnabata iji osisi esrese kụzie ụtọasụsụ Igbo karịa ịgbaso usoro nkuzi nkịtị, n’ihi na ọ ga-enye aka ime ka ụmụ akwụkwọ sonye na mmeremme ihe ọmụmụ, ma dịkwara ha mfe ịghọta iwu ma ọ bụ usoro okwu Igbo.