MMEGBU NA NHAZI DỊKA O SIRI METỤTA NDỊ IGBO NA NAỊJIRỊA

  • Joy Ifeadikanwa Obayi

Résumé

Ndị Igbo bụ otu agbụrụ dị n’ala Naịjirịa. Ha bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ndị Igbo bụ mba gbasiri ike. Ha na-adị uchu n’ihe niile ha na-eme. Ọ na-adị ka ha na-ahụta onwe ha na a na-emegbu ha emegbu n’obodo Naịjirịa n’otu e si eke oke, ya na ihe ndị ọzọ gasị. Onye nchọcha ga-eme nlegharị adịm were mee nchọcha a. Nchọcha ga-abụkwa n’akụkụ Igbo niile ka a ga-eme ya iji nweta ụsa nye isiokwu a na-ekwu maka ya. Nchọcha ga-agba ajụjụ ọnụ nye mmadụ ole na ole iji mata uche ha gbasara isiokwu a. A ga-eji ajụjụ nchọcha abụọ na ụmaokwu abụọ were mee nchọcha a. Nchọcha a ga-enye aka ime ka a mara ọnọdụ ndị Igbo nọ n’obodo Naịjirịa. Ọ gaenyekwa aka na nhazi nke e kwesiri ịhazi Naịjirịa ka obi were dị onye ọ bụla mma, ka a ghara imegbukwa akụkụ ụfọdụ na Naịjirịa. Nchọcha ga-ewere steeti ise bụ ndị Igbo kpọm kwem mee nchọcha nke gụnyere Steeti Anambara, A bịa, Ebọnyi, Enugwu na Imo; ma serekwa mmadụ iri atọ na steeti ọ bụla mee nchọcha. Nke pụtara ọnụọgụ mmadụ narị na iri ise. A ga-ejikwa miin na ndịpu izugbe hazie ajụmaza ma werekwa t-teesti hazie ụmaokwu. Nchọcha tulegharịrị ụsa nchọcha ma chọpụta na a na-emegbu ụfọdụ mpaghara dị na Naịjirịa ma ndị ahụ bụ ndị Igbo. A chọpụtara na ọ bụ kamgbe a lụchara agha nke dapụtara na Naịjirịa ebe ndị Igbo na ufọdụ ndị agbataobi ya chọrọ ka ha nọrọ onwe ha ghara ịbụzị otu n’ime ndị Naịjirịa. Nchọcha kpokọtara nchọcha ya site n’ibunye uche ihe a ga-eme ka nhazi a nwee isi ka udo were laghachi azụ n’obodo Naịjirịa. Igodo Okwu: Mmegbu, Ndị Igbo, Ọnọdụ, Uchu, na Nhazi

Publiée
2024-08-16
Rubrique
Articles