MMETỤTA NZURUỤWA NWERE N’EBE OMENAALA IGBO DỊ TAA

  • Dr Mrs Charity Ijeoma Ogbu
  • Prof. Uju C. Umo

Résumé

Nchọcha a lebara anya na mmetụta nzuruụwa nwere n’ebe omenaala Igbo dị taa na mpaghara Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta mmetụta nzuruụwa nwere n’ebe omenaala Igbo dị dịka nkwenye ndị Igbo, asụsụ Igbo, echichi, agụmagụ ọdịnaala, ewumewu, alụmalụ, ekpemekpe, ọrụ nkanaụzụ, ekike, nri, na amamiihe ọdịnaala Igbo. Otu ajụjụ nchọcha ka e ji mee nchọcha a. Usoro nkọwa sọvee ka a gbasoro wee mee nchọcha a. Ndị e ji mee nchọcha bụ ụlọakwụkwọ sekọndịrị niile gọvmenti nwe na mpaghara Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Usoro nhọrọ igwe ka a gbasoro wee họpụta ndị e jiri mee nchọcha a. Usoro nhọrọ ebumnobi ka e ji họpụta steeti atọ e jiri mee nchọcha. Onye nchọcha gbasọkwara usoro nhọrọ ebumnobi họpụta ndị okenye nke ndị nkuzi so n’ime ha ma ha dị iri atọ (30) ọ gbara ajụjụ ọnụ. Ngwa nchọcha e jiri mee nchọcha bụ ajụjụ ọnụ a gbara. N’ịhazi ihe a chọpụtara, a gbasoro usoro nkọwa ndịna nweta ọsịsa ajụjụ ọnụ a gbara. Ihe a chọpụtara na nchọcha a gosiri na nzuruụwa webatara nnukwu mgbanwe n’omenaala Igbo taa, nke na a hapụzịrị omenaala na-emezi omenaelu. Site n’ihe a chọpụtara n’elu, onye nchọcha tụrụ alo mkpa ọ dị inye ma ndị nkuzi asụsụ Igbo ọzụzụ, ma ndị okenye obodo tinyere nne na nna gbasara mkpa ọ dị n’inyefe, ịkwalite na nchekwaba omenaala Igbo dka o si dibu na mbụ tupu nzuruụwa.

Publiée
2024-08-16
Rubrique
Articles