Iji Akara Ndị Metụtara Aka Zie Ozi N’igbo
Résumé
Akara ndị metụtara aka bụ ozi ndị ahụ niile mkpịsị, obu, ogwe na ikpere aka na-ezi mgbe a na-akpa ụbụbọ. Ihe nwa nchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta mpụtara aka ọ bụla na ịmata ozi akara aka ndị ahụ na-ezi kpọm kwem na mmekọrịta izugbe. Ọzọ bụ ịmata uru ozi aka na-ezibara n’omenaala Igbo. Ihe kpalitere mmụo nwa nchọcha ide n’isiokwu a bụ na ụfọdụ mmadụ edeele maka akara ezimozi metụtara ihu n’omenaala Igbo, mana e debeghị ọtụtụ ihe banyere mpụtara na ozi aka na-ezi na nzikọrịta ozi karịsịa n’omenaala Igbo, bụ nke e dere n’asụsụ Igbo kpọmkwem. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha a bụ atụtụ nke akara. A gbasoro usoro sọvee. Ndị e ji mee nchọcha a bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Igbo dị iche iche bi n’Ọnịcha. Mgbe e mechara nchọcha a, a chọpụtara na akara metụtara aka bụ ozi niile mkpịsị aka, obu na ogwe aka na-ezi. O metụtakwara ozi aka na akụkụ ahụ ndị ọzọ so ezi. A chọpụtakwara na aka nwere ọtụtụ mpụtara na ozi nke ọ na-ezi. Edemede a were na-atụzi aro ka ndị nchọcha lebaa anya ma chọpụtakwuo akara ndị ọzọ metụtara aka, ya na akara ezimozi ndị ọzọ, ka ụmụ akwụkwọ mara ha n’oge ka a ghara iji ha refuo ha.