Otu Gburugburu Si Emetụta Ọmụmụ Asụsụ Igbo N’ Ebe Nwatakịrị Nọ N’ Ụlọakwụkwọ
Résumé
Gburugburu bụ otu ihe nrụaka na-emetụta ọmụmụ asụsụ Igbo n’ usoro agụmakwụkwọ n’ala Naịjịrịa. Gburugburu nwata akwụkwọ hụtara onwe ya nwere ike inwe ezi mmetuta, ma ọ bụ ajọ mmetuta n’ọnọdụ agumakwụkwọ ya. Nke a pụtara na mmeta nke ọma nwata akwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ Igbo nwere ike dabere na gburugburu o siri pụta. Ọtụtụ ihe dị na gburugburu nwata akwụkwọ nwere ike imetụta ya n’ọmụmụ asụsụ Igbo gụnyere: Ọnọdụ akụnaụba ezinaụlọ, Omume nne na nna, otu ọgbọ/omume ndị nkụzi na ndị ọzọ. Ihe ndị a niile dị na gburugburu nwere ike ịkwalite ma ọ bụ budaa ọmụmụ asụsụ Igbo nwatakịrị n’ ụlọakwụkwọ. Ọ bụ nke a kpatara odee jiri lebaa anya n’otu ihe ndị a niile dị na gburugburu si enwe mmetuta n’ọmụmụ asụsụ Igbo nwatakịrị n’ ụlọakwụlwọ.