NKWALITE ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO SITE N’EZI ODIDE
摘要
Otu nnukwu ihe mgbu chere ntolite asụsụ Igbo aka mgba n’ihu taa bụ odide ya. Odide bụ otu ụzọ pụrụ iche ma kachakwa mma iji mee ka asụsụ ọ bụla pụta ihe. Odide asụsụ na-enye aka ime ka a matakwuo asụsụ na ndị nwe ya. Kama, odide asụsụ abụghị ihe dịcha mfe, ọ kacha odide Igbo Izugbe. Ka ọ dị taa, odide Igbo Izugbe dị ka oke ọhịa, onye si ebe o si, ọ malite sụchawa ebe ọ chọrọ. Otu ihe butere ọnọdụ a bụ na ọtụtụ ụmụafọ Igbo anaghị etinye uchu n’ihe banyere ndezi asụsụ Igbo; ụfọdụ ejighi ya bụ asụsụ kpọrọ ihe n’ụzọ ọ bụla. A bịa n’odide ya, onye ọ bụla na-edote ahụ ka ọ bụ ọkachamara. Asụsụ bụ otu ọkpụtọrọkpụ e jiri mara mba ọ bụla nke mere na ọtụtụ mba dị iche iche na-agba mbọ ịhụ na asụsụ ha na eto eto. Ọ bụrụ na ndị nwe asụsụ ọ bụla etinyeghi uchu wee kwado ntolite ya, ihe ọzọ chere ya aka mgba n’ihu bụ ọdịda na ọnwụ ike. Ọ bụ iji gbochie ọnọdụ dị otu a n’ebe asụsụ Igbo dị butere edemede nke a. Edemede a lebara anya n’ụzọ ihe atọ dị mkpa e kwesiri ibu n’obi mgbe a na-ede asụsụ Igbo, ndị gụnyere: ịmata nkejiasụsụ na ibe ya, ọ kacha ka o si metụta ‘m’ na ‘n’. Edemede a gbadoro ụkwụ n’ekereuche, nnyocha edemede na nchọpụta ndị ọkammụta ndị ọzọ mere, tinyere amamihe odee dị ka nwafọ gụrụ, maara, na-asụ, na-akụzi, ma na edekwa asụsụ Igbo nke ọma. Edemede a bara nnukwu uru n’ihi na ọ ga-enyere ndị nkụzi, nne na nna, ụmụ akwụkwọ, ndị mbipụta akwụkwọ, ndị ọrụ mgbasaozi aka ịmata ka e si edezi Igbo Izugbe nke ọma. mkpụrụokwu ọ bụla, ọrụ mkpụrụokwu, na mpụtara mkpụrụokwu ọ bụla; tinyekwara mmakọ mkpụrụ abịịchịị