Mmetụta Jenda na Mmeta Nke Ọma Ụmụ Akwụkwọ Praịmarị ndị e ji Ngwa Nkụzi Nụrụlere kụziere Agụmagụ Ọdịnaala Igbo na Zoonu Mmụta Nsụka

  • Ewelum, Chinyelum Patricia
  • Ezema, Chinenye Anthonia

摘要

Nchọcha a lebara anya na mmetụta jenda na mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ praịmarị ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere agụmagụ ọdịnaala Igbo na zoonu mmụta Nsụka. Nchọcha a tulekwara jenda na mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ ndị nwoke na ụmụ akwụkwọ ndị nwaanyị n’agụmagụ ọdịnaala Igbo dị ka o si metụta ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere na ndị ụmụ akwụkwọ e jighị ngwa nkụzi nụrụlere kụziere. Otu ajụjụ nchọcha na otu ụmaokwu bụ ihe nyere aka maka nchọcha a. Ụdị nchọcha a kwazị ‘experimental’ ka a gbasoro mee nchọcha a. Ọnụọgụ e ji mee nchọcha bụ ụmụ akwụkwọ dị puku ise, narị abụọ na asaa (5,207) ebe ndị e seere dị narị abụọ na iri abụọ (220). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha bụ Mmetụta Jenda na Mmeta Nke Ọma N’agụmagụ Ọdịnaala Igbo (MJMNỌNỌI) na Ngụkọ Mmasị na Jenda Ụmụ Akwụkwọ N’agụmagụ Ọdịnaala Igbo (NMJỤANỌI). Ihe e nwetara na data ka e ji wee zaa ajụjụ nchọcha na ụmaokwu. E ji miin na ndịpụ n’izugbe wee zaa ajụjụ nchọcha ma werekwa akara ntụ 0.05 nwalee ụmaokwu. Ihe a chọpụtara na nchọcha a gosiri na ụmụ akwụkwọ ụmụ nwoke na ndị nwaanyị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kuziri agụmagụ ọdịnaala Igbo nwere mmasị ma meta nke ọma n’agụmagụ ọdịnaala Igbo karịa ndị otu ha e jighị. Site na nchọpụta nchọcha a, e kpebiri ka e jiri ngwa nkụzi nụrụlere kụziere ụmụ akwụkwọ praịmarị agụmagụ ọdịnaala Igbo ka ha wee nwee ike na-emeta nke ọma na ya.

已出版
2024-06-15
栏目
Articles