Olu Asụsụ Ebe Obibi Ụlọ Na Mmeta Nke Ọma Ụmụ akwụkwọ Sekọndịrị Sịnịọ N’ịkpọpụta Mkpụrụokwu Asụsụ Igbo Na Zonu Mmụta Awgu Steeti Enugwu
Resumen
Nchọcha a lebara anya n’olu asụsụ ebe obibi ụlọ na mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ n’ịkpọpụta mkpụrụokwu asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị dị na mpaghara mmụta zonu Awgu. Nsogbu a na-ahụkarị n’ebe ụmụ akwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo bụ na ọtụtụ n’ime ha amaghị okwu Igbo ma ya fọdụ ịkpọpụta ya n’usoro okwu Igbo si aga. E ji Ajụjụ nchọcha abụọ na Ụmaokwu duzie ya bụ nchọcha n’usoro quasi. Ngwaa nchọcha e ji mee nchọcha bụ ajụjụ njụmaza na Mmetuta ebe obibi ụlọ na mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ n’ịkpọpụta mkpụrụokwu asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị dị na mpaghara mmụta zonu Awgu (MEOỤMNỌỤỊMAIỤSMZA). Ọ dị iri abụọ na abụọ (22) n’ọnụọgụ nke ndị ọkammụta atọ nọ na ngalaba asụsụ Igbo, Edukeshọnụ nakwa mgbakọ si na Mahadum Naijirịa Nsụka nyochara ma hụta na ọ dabara na nchọcha e ji ya eme. Ndị nchọcha mebere ya iji chọpụta ka olu asụsụ ebe obibi mmadụ si abụ ndọghachiazụ n’ikpọpụta okwu Igbo n’ogo sekọndịrị. Ọnụọgụ ndị e jiri mee nchọcha bụ ụmụ akwụkwọ sekọndịrị sinịọ ss2 dị otu puku na iri abụọ na asaa (127). E ji usoro tụmbọm tụmbọm họpụta ụmụ akwụkwọ dị iri atọ (30) n’ime ọnụọgụ ndị njirimee nchọcha. Mmasị iji klasị a mee nchọcha bụ na ha agafela n’afọ nke mbụ n’ogo sinịọ batazịa n’ogo afọ nke abụọ bụ ogo a tụrụ anya n ha enweela ntọala gbasara ụtọasụsụ Igbo marakwa olu asụsụ dị iche iche e nwere na ebe obibi ha nke na-abụkarị ndoghachi azụ nye ịkpọpụta okwu Igbo ha nke ọma. E mere nnwale ntụkwasiobi nyere akara 0.78 n’usoro Crombach Alpha. Usoro nhazi data bụ nke e ji mgbakọ miin na ndipunizugbe maka ajụjụ nchọcha ebe enyochara ụmaokwu nchọcha n’akara agbamonwe ANCOVA. Mpụtara ihe a chọpụtara gosiri na ọtụtụ oge, ụdị olu dị iche iche abụghị Igbo Izugbe a na-asụ/anụ n’ebe obibi mmadụ hụrụ onwe ya na-eme ka ọtụtụ ụmụ akwụkwọ hapụ ịma nke bụ mkpụrụokwu Igbo Izugbe nke ọma, ma ya fọdụ ịkpọpụta ya were were n’ọnụ ha. Nke a na-ebute ọdịda na emetaghị nke ọma ha n’asụsụ Igbo maka na ọ bụ ihe e kwuru n’ọnụ ka a na-ede n’akwụkwọ. Ndị nchọcha tụrụ aro ka gọọmentị nye aka n’ịkwalite ọmụmụ asụsụ Igbo site n’imebe labụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị dị iche iche na Steeti Enugwu iji nyere ha aka n’ịkwalite mmụta ịkpọpụta okwu Igbo na mmasị ụmụ akwụkwọ nwere n'ịmụ asụsụ Igbo.Ọzọ kwa gọọmentị ga-agba mbọ iguzobe ọgbakọ semina ebe a ga ekughere ndị nkuzi usoro itinye ihe ndị a n’ọrụ maka ọmụmụ asụsụ Ig